Igbo Proverbs, Idioms & Phrases: Recent Episodes

Blossom Ozurumba

A 2-minute podcast that you can quickly and easily listen to that will ideally share one Igbo Language Proverb, Idiom, or Phrase, provide the literal meaning and the figurative explanation while suggesting the most applicable English language equivalent.

View Details

Date: August 15, 2022

Podcast Title: E ree oké ọkpa nọ n'ógbè, agbataobi amara na itete ụra bu ọrụ
Season 01|Episode 04
Episode title and number: IPIP S01E04

Summary of episode:

Igbo bụ Igbo, mma mma nụ!. N’ụbọchi nke taa n'Igbo Proverbs, Idioms and Phrases, anyị ga-ekwu maka inwe obi ekele. Ọ bụ ihe ọṅụ na ndi mmadụ kwupụtara ma gosipụta ka obi dị ha nyegara ndi mmadụ ibe ya karịsịa mgbe ha nọ n’etiti anyi. Ndụ adighi adigide. Biko, kelee ma kwanyere ndị mmadụ ugwu, maka echi di ime, onweghi onye ma ihe ọ ga amụ.

Host: Mụ nwa, Blossom Ozurumba, na-anabata gị dịka oge niile. Ngwa, were ilu nke ga abara gi uru...

Igbo: E ree oké ọkpa nọ n'ógbè, agbataobi amara na itete ụra bu ọrụ.

Literal Translation: Na ikọwa ya n'okwu bekee, nke a pụtara, “When the neighborhood rooster is sold in the market square, the entire neighbours will finally know that it takes some effort to wake up daily, on time.”

English Language Equivalent: Ngwa were otu ọmụmatụ odidi ya na asụsụ bekee, “You never know what you have until you lose it, and once you lose it, you would never get it back”.

Sponsor:

Cheta n’ọbụ ndi otu Igbo Wikimedians User Group wetere unu ya bụ Igbo proverbs, idioms and phrases. Biko gaa na www.wikimediaigbo.org ka ikpọtụrụ ha ma kelee ha maka nkwado ha.

Call to Action: Maka ihe ndi ọzọ gbasara usoro nke Igbo proverbs, idioms and phrases, biko gaa na www.igbopip.com ka imara ha n'uju. Ndewo ndi ọma pụrụ iche.

View Details

Igbo ndi ọma pụrụ iche, ndeewo nu. N’ụbọchi nke taaa na Igbo Proverbs, Idioms and Phrases, anyị ga-ekwu maka ndidi. Ndidi bụ ikike nke mmadụ nwere iji nwayọọ na-edi ihe mgbu na ọnọdụ ndị siri ike. Ọ pụtakwara ikike ịnakwere igbu oge, nsogbu, ma ọ bụ nhụjuanya na-enweghị iwe ma ọ bụ nchegbu.

Greeting to the very distinguished Igbo people. Today on Igbo Proverbs, Idioms and Phrases, we will talk about patience. Patience is a person's ability to calmly endure pain and difficult situations. It also means the ability to accept delays, problems, or suffering without anger or worry.

View Details

Igbo bụ Igbo, mma mma nụ! N’ụbọchi nke taaa na Igbo Proverbs, Idioms and Phrases, anyị ga-ekwu maka Ọji. Ndị Igbo na-ejikọta Ọji na ndụ n'onwe ya maka ọ n’egosipụta ịhụnanya, ịdị n'otu, nsọpụrụ, udo na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Onye nyere mmadụ ibe ya ndụ hụrụ ya n’anya. Nke a pụtara n’inye mmadụ ibe gi ọjị n’egosi ihụnanya.

Greetings! Today on Igbo Proverbs, Idioms and Phrases, we will be talking about the kola nut. The Igbo People associate the kola nut with life itself as it symbolises love, unity, honor, peace and so much more. The individual that offers life to another loves the person. This signifies that offering kola nut to another expresses love.

View Details

Intro: Ndeewo ndi ọma pụrụ iche. Ana m anabata unu n'usoro nke Igbo proverbs, idioms and phrases. Ebea ka anyi ga ekwuputa ụfọdụ ilu, akpaalaokwu na nkebi okwu nke di n'asụsụ Igbo.

Anyi ga eji nkeji abụọ n'atufughi oge, kwuputa otu ilu, akpaalaokwu ma ọ bụ nkebi okwu na asụsụ Igbo, kọwaa ya n'okwu bekee ma nyekwa ọmụmatụ nke odidi ya na asụsụ bekee.

Sponsor: Ọ bụ ndi otu Igbo Wikimedians User Group di na obodo Naijiriya na ewetara unu ya bụ Igbo proverbs, idioms and phrases. Biko gaa na www.wikimediaigbo.org ka ikpọtụrụ ha ma kelee ha maka nkwado ha.

Host: Ọ bụ mụ, Blossom Ozurumba n'anabata unu n'usoro nkea. Biko were oche ma nyem nti gi maka na oge eruola. Nnọọ.

Call to action: Maka ihe ndi ọzọ gbasara usoro nke Igbo proverbs, idioms and phrases, biko gaa na www.igbopip.com ka imara ha n'uju. Ndeewo nu.